NHỤRỤ ỤWA NDỊ IGBO SITE N’AKỤKỌNEEGWỤ MIKE EJEAGHA

Main Article Content

Onyinye Maryann Onyenweife

Abstract

Nchọcha a, lebara anya n’akụkonaegwu Mike Ejiagha dịka a enyo eji ahụta ndụ ndi Igbo.Onọdụ akụkonaegwu nọzị na ndụ ndị Igbo ugbua bụ ihe ịgba anya mmiri nyere nwaafọ Igbo ọbụla ihe gbasara omenaala na-echu ura. N’ime oru nchọcha, nwanchọcha lebara anya na nhụrụ ụwa ndị igbo n’akụkoneegwụ Mike Ejeagha. O bụ nleda anya e ledara akukọneegwu n’obibi ndụ ndị Igbo/nhụrụ ụwa ha, bụ otu nsogbu nke butere asụsụ na omenaala Igbo ji dizie ka a ga-asị na ọ bụ ihe dara mmiri ma na-anyụ ka ọkụ. O bụ n’ ihi oke nsogbu a, kpalịtere mmụọ nwancọcha iji mee nchocha n’isiokwu a. Ebumnobi nwanchọcha bụ ịkwalite agụmagụ odịnaala nke akụkọneegwu di n’ime ya. I gosi nhụrụ ụwa ndi Igbo n’egwu Mike Ejeagha. Ihe ndi a bụ ihe Igbo ji bụrụ Igbo nke na anwụ anwa n’ oge ugbu a. Nwanchọcha gbasoro ụsoro nkowa, n’ihi ya, ọ gara ebe ndị di mkpa iji nweta akukọneegwu ndi ọzọ di mkpa tinyekwara ndi e jiri mere ebe nlere anya. Ọ bụ atụtụ emereme ka a gbasoro mee nchocha a. Site na ntule nwanchocha n’egwu ndi e jiri mere nlere anya na akụkonyeegwu ndi ozo e webatara, a chọputara na ọ bụ ndụ ndị Igbo ka akụkọneegwụ ndị a gbadoro ukwu. N’ihi nke a, nwanchocha tụtara alo ka ndị Igbo chekwaa akukoneegwu ha n’ihina ọ bụ ọru diiri agburu ọbula ichekwa omeneela ha. N’otu aka ahụ na-agwa ndi Igbo ka ha na-ege akụkọneegwu n’ihi na ọ na-enye ọnụ dika egwu ndi ọcha na ogbo ha ndi ọzọ. Ọzọkwa dika ibe ya bụ na o juputara na nkuzi ihe di icheiche gbasara ndụ na obibi ya.

Article Details

How to Cite
Onyenweife, O. M. (2023). NHỤRỤ ỤWA NDỊ IGBO SITE N’AKỤKỌNEEGWỤ MIKE EJEAGHA. EBSU Journal of Social Sciences and Humanities, 13(2). Retrieved from https://ebsu-jssh.com/index.php/EBSUJSSH/article/view/111
Section
Articles
Author Biography

Onyinye Maryann Onyenweife, Ebonyi State University Abakaliki Ebonyi State, Nigeria

Ngalaba Asụsụ na Lingwistiks