NDỌGHACHI AZỤ ỌMỤMỤ ASỤSỤ IGBO N’ỤLỌAKWỤKWỌ SEKỌNDỊRỊ NDỊ DỊ NA KANSỤLỤ ABANKALEKE N’OKPURU ỌCHỊCHỊ STEETI EBONYI
Main Article Content
Abstract
Asụsụ bụ ụzọ ndị si egosipụta ndụ na nhụrụụwa ha. Mba ọbụla n’ụwa gaa gburugburu nwere asụsụ ha na-asụ ma bụrụ asụsụ njirimara ha. Asụsụ Igbo bụ otu n’ime asụsụ a na-asụ n’ala Naịjirịa. Asụsụ Igbo na-anyụzi dịka ọkụ, ndị nwe asụsụ a ejighizi ya kpọrọ ihe. Ọ bụ ọnọdụ dị otu a kpalitere mmasị nchọcha a nke bụ ịchọpụta ihe ndị na-ebute ndọghachi azụ ọmụmụ asụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ Sekọndịrị ndị dị na kansụlụ Abankaleke nke dị n’okpuru ọchịchị steeti Ebonyi. Atụtụ a gbadoro ụkwụ wee mee nchọcha a bụ atụtụ mmekọrịta mmadụ na ibe ya nke Albert Bandura (1977). Nchọcha a bụ nke nlegharị adịm. Usoro nhọpụta njirime gbadoro ụkwụ n’ụlọakwụkwọ Sekọndịrị iri ebe a họrọ ụmụakwụkwọ narị abụọ. A gbara ndị njirime ajụjụ ọnụ nke a gụpụtaara ha site na njụmaza, ma site na nke a nweta njatule e jiri mee ntụcha. Site n’ọsịsa e nwetara, nchọcha a hụtara na ihe ndị na-ebute ndọghachi azụ a gụnyere: iji asụsụ Bekee akuzi asụsụ Igbo, ejighi ngwa nkuzi ziri ezi akuzi asụsụ Igbo, akparamaagwa ndị nne na nna n’ebe asụsụ Igbo nọ, enweghi ọtụtụ ndị nkuzi a zụrụ n’ikuzi asụsụ Igbo, na nleghara anya gọọmentị. Ndị nchọcha gara n’ihu tụpụta aro ndị ga-ebelata ndọghachi azụ ndị a, nke gụnyere: iji asụsụ Igbo akuzi asụsụ Igbo, iji ezi ngwa nkuzi akuzi asụsụ Igbo, ndị nne na nna na ụmụ ha iji asụsụ Igbo akparịta nkata, ịkwalite ọmụmụ asụsụ Igbo na kọleje ebe a na-azụ ndị nkuzi, na kwa gọọmentị ime ka ọ bụrụ iwu n’ụlọakwụkwọ ọbụla nọ na Steeti Ebonyi ga na-akuzi asụsụ Igbo. Ha kwenyere na aro ndị a ha tụpụtara ga-enye aka kwalite ọmụmụ na uto asụsụ Igbo.