NKỤZI MMEREMME OMENALA AKPAMOKE NDỊ IGBO NA ỤZỌ NKWALITE IKIKERE ỤMỤNWAANYỊ MAKA NWETA EBUMNOBI MBA ỤWA N’ỌNỌDỤ ABỤM NWAANYỊ N’OGO SENCHURI IRI ABỤỌ N’OTU
Main Article Content
Abstract
Nchọcha a lebara anya na nkụzi mmeremme omenala akpamoke n’ala Igbo na ụzọ nkwalite ikikere ụmụnwaanyị maka nweta ebumnobi mba ụwa n’ọnọdụ nnwereonwe ha n’ogo senchuri iri abụọ n’otu. Mbụnuche nchọcha a bụ ịmata mmeremme omenala akpamoke e nwere n’ala Igbo bụ nke e ji emegide ọnọdụ abụm nwaanyị na ihe ndị na- egbochi ikpochapụ ha. Ajụjụ nchọcha abụọ ka e ji wee mee nchọcha a. Ndị nchọcha gbasoro usoro nkọwa sọvee wee mee nchọcha ya. E ji usoro nhọrọ nha na usoro nhọrọ ebumnobi wee họpụta ndị nkuzi asụsụ Igbo dị iri asatọ e ji mee nchọcha. Ngwa e jiri mee nchọcha a bụ njụmaza bụ nke ihe e depụtara na ya dị iri atọ na abụọ (32) n’ ime nkeji abụọ. Maka inyocha ngwa nchọcha, ndị nkụzi abụọ na ngalaba amụmamụ Igbo na otu onye nkụzi na-akụzi na ngalaba measurement na evaluation lebara anya na ya, bụ ndị si na ngalaba mahadum nke Naịjirịa Nsukka. Ndị nchọcha lelere ịnọgide n‘ọnọdụ nke agbanweghị agbanwe site n‘iji usoro ntụcha data a na-akpọ Cronbach‘s Alpha na Bekee, ma e nwetara akara 0.75. E jiri ntụcha miin, ndịpụ n‘izugbe wee nweta ọsịsa ajụjụ nchọcha. Nchọcha e mere gosiri na omenala akpamoke ndị a dị iche iche e nwere n’ala Igbo gụnyere nwoke igosipụta ikikere dị iche iche n’ihi na ọ kwụrụ ụgwọ isi nwaanyị, ịhapụ inye nwaanyị oke ọbụla ma ọ gbaa alụkwaghị m, ịkwụghachi ụgwọ isi nwaanyị, ịhụta nwa nwoke dịka naanị ihe bụ nwa n’ala Igbo na ndị ọzọ. Nchọcha ọzọ gosikwara na ihe ndị na- egbochi ikpochapụ omenala mmekpa ahụ ndị ahụ n’ala Igbo gụnyere nkwenye ha nwere n’omenala Igbo, agụmakwụkwọ a napụrụ ụmụnwaanyị ikikere ya n’oge gboo, mperi mmejupụta iwu dị iche iche na ndị ọzọ. Ndị nchọcha tụtara alo mkpa ọ dị inye ụmụnwaanyị, ụmụnwoke niile, ndị eze, ndị chiri echichi, ọha na eze ndị Igbo, ọzụzụ ịmata mkpa ọ dị ime ka ụmụnwaanyị nwere onwe ha n’omenala akpamoke ndị a, nakwa uru ọ bara n’ịkwalite ọnọdụ ezinaụlọ nakwa akụnụba ọha obodo.