ỊTỤLE NGOSI OGE N’OLU ẸZAA

Main Article Content

Jeremiah A. Nwankwegu
Ndụbụisi Joseph Nwanganga

Abstract

Isi okwu nchọcha a bụ ịtụle ngosi oge n’olu Ẹzaa. Mbunuche ya bụ ịmata ogo oyiyi na ndịmiche n’etiti ngosi oge Igbo izugbe na olu Ẹzaa. Nchọcha a bụ nke nkọwa. E ji nleta nsonye, ntụlegharị agụmagụ na amamihe e nwere, nakọta ma họrọ njatụle nke nchọcha a. Nchọcha a gbasoro atụtụ ndokọ nakwa atụtụ amụmamụ mkpụrụ ụda ndịnonwe. A chọpụtara na olu Ẹzaa na-agbaso usoro mwube okwu Igbo izugbe na mmem ngosi ụdị oge ọ bụla. A chọpụtakwara na ndịmiche ha na-esi na ndị iche n’etiti mkpụrụ asụsụ ụfọdụ nwere otu ụdị ọrụ. Ọzọ, mmem ngosi oge ndịnugbu n’Igbo izugbe na-agbaso iwu ndakọrịta ụda ume mana nke Ẹzaa anaghị agbaso. Ọzọ kwa, na mgbakwụnye ‘r+ụ’ e ji emebe oge ndịnazụ, ‘ụ’ nke Igbo izugbe na-abụ mmụba ụda ume isi ngwaa, mana nke Ẹzaa na-abụ ụda ume u/ụ dabere na ndakọrịta ụda ume. A chọpụtakwara na Igbo izugbe nwere mkpụrụ asụsụ pụrụ iche e ji ewube ngwaa ngosi oge ndịnugbu na umezi ndịnihu n’otu n’otu, mana olu Ẹzaa na-eji otu ụdị mkpụrụ asụsụ ewube ngosi oge ndịnugbu na umezi ndịnihu; naanị akara ụda olu ka e ji amata nke bụ nke n’olu asụsụ ahụ. Nchọcha a gosipụtara uru akara ụda olu n’izipụta ndịmiche n’echiche ndokọ okwu nwere otu nhazị mkpụrụ edide. Ya mere e ji tụọ arọ ime nchọcha n’etu ụda olu si abata n’igosipụta ndịmiche n’ewumewu nwere otu ụdị ndokọ; ọ bụghị sọ n’olu Ẹzaa kama n’Igbo izugbe na n’olu ndị ọzọ.

Article Details

How to Cite
Nwankwegu, J. A., & Nwanganga, N. J. (2025). ỊTỤLE NGOSI OGE N’OLU ẸZAA. EBSU Journal of Social Sciences and Humanities, 15(2 & 3). Retrieved from https://ebsu-jssh.com/index.php/EBSUJSSH/article/view/306
Section
Articles
Author Biographies

Jeremiah A. Nwankwegu, Ebonyi State University, Abakaliki – Nigeria

Ngalaba Asụsụ na Lingwistiks

Ndụbụisi Joseph Nwanganga, Ebonyi State University, Abakaliki – Nigeria

Ngalaba Asụsụ na Lingwistiks