MMETỤTA AGWA NDỊ NKỤZI N’ỌMỤMỤ ABụ EDEREDE IGBO N’OGO SEKỌNDỊRỊ UKWU NA ZOONU MMỤTA ENUGU, STEETI ENUGU

Main Article Content

Martina Chinasa Okolo
Uchenna Fabian Ude

Abstract

Nchọcha a lebara anya na mmetụta agwa ndị nkụzi n’ọmụmụ abụ ederede Igbo n’ogo sekọndịrị ukwu na zoonu mmụta Enugu, Steeti Enugu. Ndị nchọcha lebara anya n’ịmata ka agwa ndị nkụzi si emetụta ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ abụ ederede Igbo. Mbunuche anọ na ajụjụ nchọcha anọ duziri ọrụ a. Ụdị nchọcha a gbasoro mee nchọcha a bụ nke sọvee nkọwa. Ndị e jiri mee nchọcha a bụ ụmụakwụkwọ gọọmenti nọ n’ogo sekọndịrị ukwu nke abụọ (SS2) na zoonu mmụta Enugu, Steeti Enugu ndị dị narị abụọ na iri atọ na asaa (237), nke e nwetara n’ọnụọgụ ụmụakwụkwọ dị pụkụ anọ, narị asaa, iri atọ na asaa (4,737). E jiri usoro nhọrọ nsere tụmbọm tụmbọm wee họpụta ndị e jiri mee nchọcha a. Ngwa nchọcha e jiri mee nchọcha a bụ Mmetụta Agwa ndị Nkụzi n’ọmụmụ Abụ Ederede Igbo (NMANNỌAEI) nke nwere mkpokọta anọ na ndịna iri abụọ na anọ (24). Mkpokọta ihe e nwetere n’adịmụmma ngwa nchọcha a bụ 0.99. Nke a na-egosi na adịmụmma ngwa a dabara adaba.Ndị nchọcha jiri ngwa ntụcha miin na ndịpu n’izugbe wee hazie ma tụchaa ihe ihe ọrụ e nwetere na nchọcha a. Ọkpụrụkpụ ihe a chọpụtara gosiri na mmasị ndị nkụzi, iwe ọkụ ndị nkụzi na ịṅụbiga mmanya oke ndị nkụzi anaghị emetụta ọmụmụ abụ ederede Igbo n’ogo sekọndịrị ukwu ebe ịpịa ụtarị ndị nkụzi na-emetụta ọmụmụ abụ ederede Igbo. Aro a tụpụtara maka nchọcha ọdịnihu gụnyere ndị a: ụmụakwụkwọ ga-agba mbọ na-esonye n’ihe ọmụmụ abụ nke ọma n’agbanyeghị agwa ndị nkụzi ha ebe ndị nkụzi ga-agba mbọ na-akpa ezigbo agwa nke ụmụakwụkwọ ga na-eṅomi nke ga-eme ka ha nwewe mmasị n’ọmụmụ abụ ederede Igbo.

Article Details

How to Cite
Okolo, M. C., & Ude, U. F. (2025). MMETỤTA AGWA NDỊ NKỤZI N’ỌMỤMỤ ABụ EDEREDE IGBO N’OGO SEKỌNDỊRỊ UKWU NA ZOONU MMỤTA ENUGU, STEETI ENUGU. EBSU Journal of Social Sciences and Humanities, 15(2 & 3). Retrieved from https://ebsu-jssh.com/index.php/EBSUJSSH/article/view/307
Section
Articles
Author Biographies

Martina Chinasa Okolo, University of Nigeria, Nsukka

Department of Arts Education, Faculty of Education

Uchenna Fabian Ude, University of Nigeria, Nsukka

Deparyment of Arts Education, Faculty of Education