OMENALA IGBO NA ATỤMATỤ SDGs 3 (IGBO CULTURE AND SDGs 3)

Main Article Content

Benedict N. Igbokwe
Chinenye C. Olekaibe
Ngozi Theresa Onuora

Abstract

Omenala bụ ngụkọta nke ụzọ na usoro obibindụ ndị mmadụ, na mbọ ha na-agba iji gboo akamgba ndị chere ha n’ihu n’ebe obibi ha bụkwa nke ga-eme ka ihe na-aga n’ụzọ a haziri isi ma baakwara ha uru n’okwu ọchịchị ha, akụ na ụba, ọnọdụ obibi ndụ, okpukperechi, ịchọ mma nke ǹkà nakwa usoro ha si ahazi ihe, nke mere ha ji bụrụ ọpụrụiche n’ebe ndị agbata obi ha dị. Omenala gụnyere ndị a na-emetụ aka ma ndị a naghị emetụ aka. Atụmatụ SDGs 3 bụ ihe mgbaama nye mbọ nke mbaụwa niile, site na mgbakọaka n’ọrụ, iji buo agha megide agụụ, ọrịa, ịkpa oke n’etiti nwoke na nwanyị, mmetọsị na ndakpọsị nke gburu gburu ebe obibi, itibọrịbọ, ụkọ ihe ndị e ji ebi ndụ dgz. Ọ dị mwute, na dịka oge na-akụ kwarapụ kwarapụ n’ịgbaru afọ puku abụọ na iri atọ (2030), o nwebeghị ihe na-egosi na ndị Afịrịka adịrịla na njikere inwetali ọbụladị otu n’ime atụmatụ niile ndị a. Echiche nchọcha a bụ na ndị okwu dị n’aka n’atụmatụ ọrụ mmepe ndị ga-adịgide adịgide e lebabeghi anya n’omenala mba dị icha iche, dịka ụzọ e kwesịrị ịgbasoro iji nwetazuo atụmatụ ndị a a gụpụtasịrị. Nchọcha a na-ekwu na ala Igbo juputara na omenala na ọdịbendị ndị ahụ bara ezi uru, nke bụ na a kwalite ha, ga-agate aka n’ime ka e nwetazuo atụmatụ nke otu mba ụwa n’okwu ahụike. Nchọcha a gbadoro ụkwụ n’atụtụ nchọcha a nke otu mba ụwa na-ahụ maka ahụike (WHO) n’okpuru otu mmụta Lowtja Institute, nke na-akọwa mkpa omenala Mba dị n’okwu ahụike ha (The Cultural Determinants of Health Framework) wee leba anya n’ụfọdụ omenala Igbo ndị e nwere ike itinye n’ọrụ iji nweta ezi ahụike ma kpọchapụkwa ọrịa ndị a na-ebute ebute nakwa ndị na-efe efe. Nchọcha a gbasoro usoro sọvee ma lekwasịkwa anya na steeti ise ndị mebere ala Igbo. Ngwa nchọcha gụnyere ịgba ajụjụ ọnụ, nakwa ihe ndị e ji anya hụ. Site na ntụcha na ntụchasị ka nchọcha a jiri zipụta na n’ezie, omenala Igbo bụ ụzọ kwụ ọtọ iji kwagide atụmatụ oru mmepe ndi ga-adigide adigide n’okwu ahuike (SDGs 3). Nchocha a ga-abara otu mba ụwa uru, ọha ndị Igbo nakwa ndị na-eme nchọcha na nchopụta n’okwu ahụike. Nchọcha a nyekwara ntụziaka dị iche iche maka ọdinihu.

Article Details

How to Cite
Igbokwe, B. N., Olekaibe, C. C., & Onuora, N. T. (2025). OMENALA IGBO NA ATỤMATỤ SDGs 3 (IGBO CULTURE AND SDGs 3). EBSU Journal of Social Sciences and Humanities, 15(2 & 3). Retrieved from https://ebsu-jssh.com/index.php/EBSUJSSH/article/view/308
Section
Articles
Author Biographies

Benedict N. Igbokwe, Federal University of Technology Owerri, Nigeria

Directorate Of General Studies

Chinenye C. Olekaibe, Federal University of Technology Owerri, Nigeria

Directorate of General Studies