NNYOCHA USOROOKWU MMEMỤBARA NNỌRỌ ONWE N’OLU ABANKELEKE
Main Article Content
Abstract
Asụsụ niile nwere ụzọ dị iche iche ha si ezipụta ihe dị n’ụbara, ya bụ ihe karịrị otu. Asụsụ Igbo dị ka asụsụ ndị ọzọ nwere etu e si e egosipụta ihe karịrị otu n’Igbo izugbe nakwa n’olu dị iche iche. Olu Abankeleke dị ka otu n’ime olu ndị Igbo nwekwara ụzọ pụrụ iche o si ezipụta ihe dị n’ụbara. Nchọcha a lebara anya na nnyocha usorookwu mmemụbara nnọrọ onwe n’olu Abankeleke. Mbunuche nchọcha a bụ ịchọpụta mmemụbara nnọrọonwe n’olu Abankaleke dị ka o si metụta usoro okwu olu Abankaleke. Nchọcha a gbasoro usoro usorookwu were kọwa mmemụbara olu Abankeleke. nke Steti Ebọnyị. Nchọcha a nyekwara ọtụtụ ọmụma atụ ahịrị okwu ebe mkpụrụ okwu na-arụ ọrụ dịka mmemụbara nnọrọonwe n'olu Abakaleke nke Steti Ebọnyị. Nchọcha a gbasoro atụtụ iwu abụmisi nke Chomsky (1981). Ụdị nchọcha e ji rụọ ọrọ bụ nkọwasị ndizi mma. A gbara ndị mmadụ asatọ n'ọnụmara atọ mebere olu ndị Abakaleke ndị gụnyere Ẹzaa, Izii and Ikwo ajụjụ ọnụ iji nweta ngwaa ọrụ e ji mee nchọcha a. Aro odee maka nchọcha ọdinihu bụ ka ọchọcha ọzọ lebaa anya n'ihe ngwagharị dị iche iche dị na mmemụbara izugbe na olu ndị ọzọ. Nchọcha a chọpụtara na mkpụrụ okwu mmemụbara nnọrọenwere n’olu Abankeleke gụnyere: ayị’,‘ùnú, ẹ̀phé/whé, úrù, ézè, mkpọrọ ọ̀ha/ọha, ńdù, únwụ̀. . Aro odee maka nchọcha ọdinihu bụ ka ọchọcha ọzọ lebaa anya na mmemụbara nnọrọonwe dị iche iche n'olu ndị ọzọ.