NTỤGHARỊ AKWỤKWỌ ỌGỤGỤ IDUAZI ALA BINGO NKE D.N.ACHARA SITE N’ASỤSỤ IGBO FERE N’ASỤSỤ BEKEE NSOGBU NA USORO NTỤGHARỊ.

Main Article Content

Agatha Ọbịageli Medolu
Maudline Adaora Eze
Jacinta Ndidi Okey-Agbo

Abstract

Isi sekpụ ntị na nchọcha a bụ ntụgharị akwụkwọ ọgụgụ Iduazi Ala Bingo nke D.N.Achara dere site n’asụsụ Igbo fere n’asụsụ Bekee. E nwere ụdịdị akwụkwọ agụmagụ dị icheiche. Akwụkwọ agụmagụ ndị a bụ agụmagụ iduazị,agụmagụ abụ,agụmagụ ejije nakwa agụmagụ nka. Anyị chọpụtara na ọtụtụ mmadụ anaghị enwe mmasị n’ebe asụsụ Igbo dị karịsịa n’ịgụ maọbụ ide asụsụ a. Nsogbu nleghara anya asụsụ a kpatara ọdịda mba ụmụ ntorobịa banyere asụsụ Igbo n’oge ugbu a. Ọ bụ nsogbu a kpaliri mmụọ anyị ime nchọcha n’isi okwu a. Mbunuche anyị bụ site n’ụdị nchọcha a, a ga-eme ka ndị mmadụ kachasị ndị na-eto eto nwekwaa mmasị ọzọ n’ebe asụsụ na omenala Igbo dị. E webatara atụtụ nakwa usoro ntụgharị nke Newmark(1981) wee mee ntụgharị. Iji hụ na enwere ezi echiche na ntụgharị nke gbasoro ezi usoro. Usoro ntụgharị a gbasoro na nchọcha a gụnyere, echiche kacha yie echiche, mbụmoto, ndaba, nsoronelu dgz. Site na nchọcha a, a ga-eme ka mmadụ ghọta asụsụ omenala Igbo nke dị n’akwụkwọ ọgụgụ Ala Bingo. Site na itinye ya n’asụsụ ndị mba ọzọ, ọ ga-akpalikwa agụụ ndị ọzọ ime nchọcha na ntụgharị agụmagụ. Ime nchọcha gaa n’ihu ga-eme ka amụbanye mkpụrụokwu asụsụ Igbo ma mee ka asụsụ Igbo too karịa. Aro anyị na-atụnye bụ ka emee ntụgharị akwụkwọ ọgụgụ dị icheiche gaa n’ihu.

Article Details

How to Cite
Medolu, A. Ọbịageli, Eze, M. A., & Okey-Agbo, J. N. (2023). NTỤGHARỊ AKWỤKWỌ ỌGỤGỤ IDUAZI ALA BINGO NKE D.N.ACHARA SITE N’ASỤSỤ IGBO FERE N’ASỤSỤ BEKEE: NSOGBU NA USORO NTỤGHARỊ. EBSU Journal of Social Sciences and Humanities, 13(3). Retrieved from https://ebsu-jssh.com/index.php/EBSUJSSH/article/view/133
Section
Articles
Author Biographies

Agatha Ọbịageli Medolu, Mahadum Nke Na ị jiria, Ns ụ ka

Ngalaba Lingwistiks, Igbo na Asụsụ Naịjiria Ndị Ọzọ.

Maudline Adaora Eze, Mahadum Steeti Ebonyi, Abakaliki

Ngalaba Asụsụ na Lingwistiks

Jacinta Ndidi Okey-Agbo, Mahadum Naịjiria Nsụka

Ngalaba Lingwistiks, Igbo na Asụsụ Naijiria Ndị Ọzọ