NNYOCHA NDEJỌ NNYEMAKA NGWAA N’IGBO DỊKA ASỤSỤ EPUM

Main Article Content

BENJAMIN CHIMUATỤLAMỤRA IGBEAKỤ
FABIAN UCHENNA UDE
DORATHY ONYINYECHI IGBEAKỤ

Abstract

Asụsụ a sụrụ maọbụ e dere n’ụzọ ezighị ezi anaghị ezipụta mbunuche ọsụụ maọbụ odee. Ụfọdụ edemede ụmụakwụkwọ nọ na mahadum na-ede anaghị adaba adaba. Ọnọdụ dị otu a na-egosi ịda mba n’iwu na-achịkwaba usoro odide asụsụ Igbo tụmadị ka o siri metụta nnyemaka ngwaa. Mbunuche nchọcha a bụ inyocha ndejọ̀ nnyemaka ngwaa n’Igbo dịka asụsụ epum n’edemede Igbo. Ndị e jiri mee nchọcha a bụ ụmụakwụkwọ asụsụ epum ha bụ Igbo ma bụrụ ndị na-agụ asụsụ Igbo nọ n’afọ nke abụọ na Mahadum Naịjirịa, Nsụka. E jiri usoro nsere wee họrọ ụmụakwụkwọ iri abụọ bụ ndị nọ n’afọ nke mbụ n’ihe ọmụmụ afọ 2021/2022. Usoro nkọwa ka e jiri mee nchọcha a. Ngwa nchọcha e jiri nweta njịatule bụ nanị edemede ụmụakwụkwọ dere. A chọpụtara na ụmụakwụkwọ enweghị nka mmụta zuru oke banyere iwu na-achịkwaba usoro odide nnyemaka ngwaa. Ọzọ, nnyemaka ngwaa atọ bụ ihe doro ụmụakwụkwọ anya dịka ‘ga-, na-, ka-’. A chọpụtara ụzọ ise ụmụakwụkwọ kachasị enwe ndejọ nnyemaka ngwaa dịka: itinye mbuụzọ ebe nnyemaka ngwaa kwesiri ịbata, ideko nnọchipesịn ụbara nke atọ na nnyemaka ngwaa ọnụ, itinye akara uhie n’agbata nnyemaka ngwaa abụọ na-eso onwe ha, iwebata akara uhie na nnyemaka ngwaa nwere nsonazụ, na itinye rịkọm na nnyemaka ngwaa ka mbuụzọ. A chọpụtakwara na ihe butere ndejọ̀ ndị a bụ mmakpọfere, amaghị iwu na emezughị ihe iwu kwuru. N’ikpeazụ, a chọpụtara na ndejọ nile e zipụtara na nchọcha a nupuru isi n’usoro odide nnyemaka ngwaa n’Igbo ebe isi sekpu ntị butere ndejọ̀ nile ahụ bụ enweghị nka mmụta banyere iwu odide nnyemaka ngwaa n’Igbo.

Article Details

How to Cite
IGBEAKỤ, B. C., UDE, F. U., & IGBEAKỤ, D. O. (2024). NNYOCHA NDEJỌ NNYEMAKA NGWAA N’IGBO DỊKA ASỤSỤ EPUM. EBSU Journal of Social Sciences and Humanities, 14(2). Retrieved from https://ebsu-jssh.com/index.php/EBSUJSSH/article/view/180
Section
Articles
Author Biographies

BENJAMIN CHIMUATỤLAMỤRA IGBEAKỤ, University of Nigeria, Nsukka

Department of Linguistics, Igbo & Other Nigerian Languages

FABIAN UCHENNA UDE, University of Nigeria, Nsukka

Department of Arts Education

DORATHY ONYINYECHI IGBEAKỤ, University of Nigeria, Nsukka

Department of Linguistics, Igbo & Other Nigerian Languages