ETU ASỤSỤ ONYE NKỤZI SI EMETỤTA ỤMỤAKWỤKWỌ N’ỌMỤMỤ ỤTỌASỤSỤ IGBO IZUGBE N’OGO SEKỌNDỊRỊ UKWU DỊ NA STEETI EBỌNYỊ NA ENUGWU

Main Article Content

Fabian Uchenna Ude
Benjamin Chimatụlamụra Igbeaku
Nneka Celine Udenwa

Abstract

Nchọcha a lebara anya n’etu asụsụ onye nkụzi si emetụta ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ ụtọasụsụ Igbo Izugbe n’ogo sekọndịrị ukwu dị na steeti Ebọnyị na Enugwu. Mbunuche nchọcha a bụ ịchọpụta etu asụsụ onye nkụzi si emetụta ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ ụtọasụsụ Igbo Izugbe n’ogo sekọndịrị ukwu dị na steeti Ebonyị na Enugwu. Ndị e ji mee nchọcha a bụ ụmụakwụkwọ ọnụọgụ ha dị puku iri na ise, narị isii iri asatọ na anọ (15,684) nọ n’ogo sinịọ sekọndịrị nke abụọ (SSII) na steeti Ebonyị na Enugu. Ndị nchọcha ji usoro nsere nhọ na nha tụmbọm tụmbọm sere ụmụakwụkwọ dị otu puku, narị ise, iri ise na ise (1,555) bụ ndị a họọrọ e ji mee nchọcha nke bụ pesenti iri n’ime mgbakọta ọnụọgụ nchọcha a bụ 15,684. Ndị nchọcha jikwaazị usoro nsere nhọ na nha tụmbọm tụmbọm sere ụmụakwụkwọ dị narị itoolu, iri itoolu na asaa (997) na steeti Enugu na ụmụakwụkwọ dị narị ise, iri ise na asatọ (558) na steeti Ebonyi. Mgbakọta ọnụọgụ ha bụ (1,555) otu puku, narị ise iri ise na ise.


Nka sọvee nkọwa ka e ji mee nchọcha a. Ndị nchọcha ji ederede njụaza a kpọrọ “Nnwale Mmetụta Asụsụ Onye Nkụzi n’ọmụmụ Ụtọasụsụ Igbo Izugbe (NMAOỌUII) mee nchọcha a. E ji miin na ndịpụ n’izugbe tụcha ihe e nwetara na nchọcha, ebe ọnụọgụ ndị e ji mee nchọcha dị otu puku, narị ise, iri ise na ise (1,555). Nchọpụta nchọcha a gosiri na asụsụ onye nkụzi ji akụzi Igbo na-emetụta ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ ụtọasụsụ Igbo Izugbe. Ndị nchọcha tụrụ aro ka ndị nchọcha ọzọ meekwuo nchọcha n’etu asụsụ ezinaụlọ si emetụta ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ ụtọasụsụ Igbo Izugbe. Ha tụkwara aro ka ndị nchọha ndị ọzọ chọpụta mmetụta agwa onye nkụzi na-emetụta ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ abụ ederede Igbo n’ogo sekọndịrị ukwu dị na steeti Ebọnyị na Enugu.

Article Details

How to Cite
Ude, F. U., Igbeaku, B. C., & Udenwa, N. C. (2024). ETU ASỤSỤ ONYE NKỤZI SI EMETỤTA ỤMỤAKWỤKWỌ N’ỌMỤMỤ ỤTỌASỤSỤ IGBO IZUGBE N’OGO SEKỌNDỊRỊ UKWU DỊ NA STEETI EBỌNYỊ NA ENUGWU. EBSU Journal of Social Sciences and Humanities, 14(2). Retrieved from https://ebsu-jssh.com/index.php/EBSUJSSH/article/view/184
Section
Articles
Author Biographies

Fabian Uchenna Ude, University of Nigeria, Nsukka

Department of Arts Education

Benjamin Chimatụlamụra Igbeaku, University of Nigeria, Nsukka

Department of Lingwistics, Igbo and Other Nigerian Languages

Nneka Celine Udenwa, University of Nigeria, Nsukka

Department of Lingwistics, Igbo and Other Nigerian Languages

Most read articles by the same author(s)