Mmetụta Jenda na Mkpọpụta Igbo Izugbe N’ogo Sekọndịrị Ukwu dị na Steeti Ebọnyịna Enugwu
Main Article Content
Abstract
Isiokwu nchọcha a bụ mmetụta jenda n’mkpọpụta Igbo Izugbe n’ogo sekọndịrị Ukwu dị na Steeti Ebonyi na Enugwu. Ndịnchọcha chọpụtara na ụmụakwụkwọ nọ n’ogo sekọndịrị ukwu na Steeti Ebonyị na Enugwu na-eji olu Igbo Waawa ede ma na-asụ Igbo Izugbe. Nke a mere ndịnchọcha ji lebaa anya na nchọcha a iji chọpụta ka ọbụ ụmụakwụkwọ ndị nwoke ka ọ bụ ụmụakwụkwọ ndị nwaanyị ka ọ ka emetụta mgbe ha na-akpọpụta ụdaasụsụ Igbo Izugbe. Nka nchọcha ndị nchọcha ji mee nchọcha bụ nke ndịmemecha, ebe ọnụọgụ ndị njirimee nchọcha bụ puku iri na ise, narị isii, iri asatọ na anọ (15,684) bụ ụmụakwụkwọ ndị sinịọ sekọndịrị nke abụọ (SS II). Ndị nchọcha seere otu puku, nari ise na iri ise na ise (1,555). N’ime ọnụọgụ ahụ, ndị nwoke dị nari asaa, iri asatọ na ise(785) ebe ndị nwaanyị dị nari asaa na iri asaa(770). Ngwa nchọcha e ji mee nchọcha a bụ Nnwale Mmetụta Jenda na Mkpọpụta Igbo Izugbe (NMJMII) nke nwere okwu iri na ise nke ụmụakwụkwọ kpọpụtara. E ji miin na ndịpụ n’izugbe tụchaa ihe a chọpụtara. A chọpụtara na abụm oke ma ọbụ nwaanyị na-emetụta ụmụakwụkwọ na mkpọpụta Igbo Izugbe na nkụzi nke gosiri na olu Igbo Waawa na-emetụta ụmụakwụkwọ na mkpọpụta Igbo Izugbe. Ụsa nchọcha a gosiri na miin e nwetara bụ 2.7 maka ndị nwoke ebe miin nke ndị nwanyị bụ 2.8 nke gosiri na ọ ka metụta ndị nwoke karịa ndị nwanyị. Ya bụ, ndị nwanyị ka mee nke ọma na mkpọpụta Igbo Izugbe. Ndịnchọcha tụrụ aro ka ndị nkụzi gbaa mbọ na-akọwara ụmụakwụkwọ ndịiche dị n’etiti olundị na Igbo Izugbe.