Mmetụta Jenda na Mkpọpụta Igbo Izugbe N’ogo Sekọndịrị Ukwu dị na Steeti Ebọnyịna Enugwu

Main Article Content

Fabian Uchenna Ude
Magnus A. Aniago
Augusta Ngozi Abonyi

Abstract

Isiokwu nchọcha a bụ mmetụta jenda n’mkpọpụta Igbo Izugbe n’ogo sekọndịrị Ukwu dị na Steeti Ebonyi na Enugwu. Ndịnchọcha chọpụtara na ụmụakwụkwọ nọ n’ogo sekọndịrị ukwu na Steeti Ebonyị na Enugwu na-eji olu Igbo Waawa ede ma na-asụ Igbo Izugbe. Nke a mere ndịnchọcha ji lebaa anya na nchọcha a iji chọpụta ka ọbụ ụmụakwụkwọ ndị nwoke ka ọ bụ ụmụakwụkwọ ndị nwaanyị ka ọ ka emetụta mgbe ha na-akpọpụta ụdaasụsụ Igbo Izugbe. Nka nchọcha ndị nchọcha ji mee nchọcha bụ nke ndịmemecha, ebe ọnụọgụ ndị njirimee nchọcha bụ puku iri na ise, narị isii, iri asatọ na anọ (15,684) bụ ụmụakwụkwọ ndị sinịọ sekọndịrị nke abụọ (SS II). Ndị nchọcha seere otu puku, nari ise na iri ise na ise (1,555). N’ime ọnụọgụ ahụ, ndị nwoke dị nari asaa, iri asatọ na ise(785) ebe ndị nwaanyị dị nari asaa na iri asaa(770). Ngwa nchọcha e ji mee nchọcha a bụ Nnwale Mmetụta Jenda na Mkpọpụta Igbo Izugbe (NMJMII) nke nwere okwu iri na ise nke ụmụakwụkwọ kpọpụtara. E ji miin na ndịpụ n’izugbe tụchaa ihe a chọpụtara. A chọpụtara na abụm oke ma ọbụ nwaanyị na-emetụta ụmụakwụkwọ na mkpọpụta Igbo Izugbe na nkụzi nke gosiri na olu Igbo Waawa na-emetụta ụmụakwụkwọ na mkpọpụta Igbo Izugbe. Ụsa nchọcha a gosiri na miin e nwetara bụ 2.7 maka ndị nwoke ebe miin nke ndị nwanyị bụ 2.8 nke gosiri na ọ ka metụta ndị nwoke karịa ndị nwanyị. Ya bụ, ndị nwanyị ka mee nke ọma na mkpọpụta Igbo Izugbe. Ndịnchọcha tụrụ aro ka ndị nkụzi gbaa mbọ na-akọwara ụmụakwụkwọ ndịiche dị n’etiti olundị na Igbo Izugbe.

Article Details

How to Cite
Ude, F. U., Aniago, M. A., & Abonyi, A. N. (2025). Mmetụta Jenda na Mkpọpụta Igbo Izugbe N’ogo Sekọndịrị Ukwu dị na Steeti Ebọnyịna Enugwu. EBSU Journal of Social Sciences and Humanities, 15(2 & 3). Retrieved from https://ebsu-jssh.com/index.php/EBSUJSSH/article/view/305
Section
Articles
Author Biographies

Fabian Uchenna Ude, University of Nigeria, Nsukka

Department of Arts Education, Faculty of Education

Magnus A. Aniago, University of Nigeria, Nsukka

Institute of African studies

Augusta Ngozi Abonyi, University of Nigeria, Nsukka

Department of Arts Education, Faculty of Education