MMETỤTA ỌRỊA NTỌNTỌ ANOMIA N’ỤTỌASỤSỤ NDỊNỌRỤ NKWỤRỊTA OKWU

Main Article Content

Ndubuisi Ogbonna AHAMEFULA
ESTHER CHIDIMMA ONUH
Chinwe N. UDECHUKWU

Abstract

Nchọcha a nychochara mmetụta ọrịa ntọntọ anomia n'ụtọasụsụ ndịnọrụ nkwurita okwu. Nkwurita okwu bụ mbido maọbụ ihe mgbakwasị ụkwụ n'ebe mmekọrịta mmadụ n'ibe ya nọ. Mbumuche nchọcha a bụ ịchọpụta etu ọrịa ntọntọ Anomia si emetụta ụtọasụsụ ndinọrụ nkwurịta okwu. E jiri usoro nlere anya na ịjụ ajụjụ ọnụ were nweta njiatule e jiri mee nchọcha a. Ọ bụ usoro nkwọwa ka e jiri hazie ihe a chọpụtara. E jiri usoro sọvee nweta njiatule nchọcha a. Ebe a nọrọ mee nchọcha a bụ nnụkwụ ụlọọgwụ dị n'Enugu a na-akpọ University of Nigerian Teaching Hospital (UNTH) dị n’Etuku Ọzalla dị n'Enugu Steeti. Ọ bụ otu dibia bekee na ndị nọọsụ abụọ na-arụ ọrụ n’ụlọọgwụ ahu ka agbara ajụjụ ọnụ iji nweta njiale nchọcha a.Ọ bụ ebe e nwere ụlọọgwụ na-ahụ maka ọrịa ntọntọ na ọrịa ndị ọzọ. Njiatule e nwetara maka nchọcha a bụ nke e jiri usoro nkọwa nyochaa Nchọpụta nchọcha a gosịrị na okwu ndị nwere ọrịa ntọntọ anaghị edo ndị mmadụ anya nke na-eme ka nghọta ihe ha na-ekwu na-agba ndị mmadụ gharị. Nchọpụta nchọcha a gosikwara na-onye nwere ọrịa Anomia na-enwe nghọta okwu e kwuru n'ọnụ. onye ahụ na-agụkwa ihe ederede mana ọ na-enwe nhiaahụ n'icheta okwu ọ ga-ekwu maọbụ ede n'akwụkwọ. Ọ na-akpọpụta mkpụrụokwu maọbụrụ na agwa ya ihe bidoro okwu ahụ. Ọ na-echefukarị nkejiasụsụ dịka ngwaa, aha na nnọchiaha mgbe ọ na-ekwu okwu maọbụ ede ihe n'akwụkwọ; Ọ nwere ike ịkọwa uru ihe bara mana ọ gaghị echeta aha ihe ahụ,

Article Details

How to Cite
AHAMEFULA, N. O., ONUH, E. C., & UDECHUKWU, C. N. (2024). MMETỤTA ỌRỊA NTỌNTỌ ANOMIA N’ỤTỌASỤSỤ NDỊNỌRỤ NKWỤRỊTA OKWU. EBSU Journal of Social Sciences and Humanities, 14(4). Retrieved from https://ebsu-jssh.com/index.php/EBSUJSSH/article/view/199
Section
Articles