MKPỌHIE NA NTAGHERI ỌNỤ ONYE ỤJỌ JI MGBE Ọ NA-EME NRỤRỊTA ỤKA (DEBATE)
Main Article Content
Abstract
Nchọcha a e mere bụ n’isiokwu bụ Mkpọhie na ntagheri ọnụ nke onye ụjọ ji na-atagheri mgbe ọ na-eme nrụrụtaụka. E mere ka a mata na jenda so n’ihe na-eme ka mmadụ na-enwe ntagheri ọnụ mgbe a na-ekwu okwu ọsọ ọsọ. Ndị na-eme nrụrịtaụka bụ ndị na-agbalị ịkwupụta ọkpụrụkpụ echiche ha ọsọ ọsọ ka ọ ga-abụ na ha ga-ekwuputacha ihe niile ha kwadoro tupu na oge e nyere ya ezuo. Ọ bụ mgbe ha na-eme nke a ka ha nwere ike ichefu otu ihe nke ga-eme ka ha nwee ntagheri ọnụ. E nwere udi nsogbu abụọ e nwere na nchọcha a. Nke mbụ bụ na a chọrọ imata ka ndị na-eme nrụrịtaụka si enwe ntagheri ọnụ. Nchọcha a ga-eme ka ndị nchọcha mata ihe ndị ha ga-eme ka wee belata nsogbu ntagheri ọnụ, ọ kachasị mgbe a na-eme nrụrịta ụka. N’inweta ihe a chọrọ, e jiri nkọwasị were chọpụtagasia ihe ndị a chọrọ. Ọ bụ ya ka e jiri kọwapụta njiatule. Ndị nchọcha kewasịrị njiatule ntagheri ọnụ dika Caroll (1986) siri mee ya.