ỤZỌ NZISA OZI ỌDỊNAALA NDỊ IGBO N’ỤMỤNYA OYI, ANAMBARA STEETI, NAỊJIRỊA, DỊKA EBE MGBADO ỤKWỤ

Main Article Content

Ahamefula Ndubuisi
Joy Adaeze Onuoha

Abstract

Nchọcha a tụlere ụzọ dị icheiche ndị Afịrịka si ezisa ozi n’usoro mgbasa ozi ndị Igbo n’ebe ha bi. Ọ gbabadoro ụkwụ n’Ụmụnya n’Oyi, Anambara Steeti, Naịjirịa. N’oge ọgbaraọhụrụ, ụfọdụ ụzọ nzisa ozi ọdịnaala bụ nke eledara anya ka ihe na-enweghị isi wee leghara ya anya. Ụzọ ọdịnaala dị icheiche ndị Afịrịka si ezisa ozi ha na-anwụzi pịị, na-agbanyeghị na ha ka dị oke mkpa n’oge ugbu a. Nchọcha a lebara anya na nzisa ozi ndị Igbo keọdịnaala, iji chọpụta ebe ha rụdebere ọrụ n’ịgbasa ozi. E ji ụdị nchọcha kenkọwa wee mee nchọcha a. Agbakwara ajụjụ ọnụ iji nweta data dị oke mkpa n’ọnụ ndị mmadụ. Nchọcha a mekwara ka a mara na na-agbanyeghị na elelịrị ụzọ nzisa ozi ọdịnaala n’Ụmụnya, ha ka dịkwa; ma jirikwa ha na-ezisa ozi n’ụzọ dị ire. Ihe ndị a ga-eme ka e nwee ezi nhazi maka nzisa ozi dị ire n’ime obodo. N’agbanyeghị na e nwegasịrị ụfọdụ ihe mkpọbiụkwụ nke ga-eme ka ụzọ mgbasa ozi ndị ahụ ghara inwe isi, ma e nwere ike ịkwụba ha nke ọma ka ha rụwakwa ọrụ ọzọ.

Article Details

How to Cite
Ndubuisi, A., & Onuoha, J. A. (2023). ỤZỌ NZISA OZI ỌDỊNAALA NDỊ IGBO: N’ỤMỤNYA OYI, ANAMBARA STEETI, NAỊJIRỊA, DỊKA EBE MGBADO ỤKWỤ. EBSU Journal of Social Sciences and Humanities, 13(2). Retrieved from https://ebsu-jssh.com/index.php/EBSUJSSH/article/view/110
Section
Articles
Author Biographies

Ahamefula Ndubuisi, University of Nigeria, Nsukka

Department of Linguistics

Joy Adaeze Onuoha, University of Nigeria, Nsukka

SGS, Humanities Igbo Unit UNEC