NKWUJỌ NA NKWUHỊE NDỊ NDỌRỌNDỌRỌ ỌCHỊCHỊ, NDỊ ỌCHỊCHỊ NA NDỊ ỌRỤ GỌỌMENTỊ NAỊJIRỊA N’OKWU ỌHA

Main Article Content

Kelechi A. Alozie
Ahamefula O Ndubuisi
Joy Adaeze Onuoha

Abstract

Nchọcha a lebara anya na nkọwapụta mmebe okwu, nkwujo na nkwuhie mgbe ndị mmadụ n’ekwu okwu n’ọha, tụmadị ndị ọchịchị obodo anyị bụ Naijịria. Nkwujọ bụ akwadoghị nke ọma tupu amalite ikwu okwu ebe nkwuhie bụ nsọgbu nke okwukwu okwu nke na-eme na mgbe mmadụ chọrọ ikwu okwu, o hapụ ihe o bu n’obi kwuo ihe ọzọ. Ebumnuche izugbe na nchọcha a bụ ịchọpụta ihe na-ebute nkwujo ma ọ bụ nkwuhie mgbe ndị ọchịchị guzo n’ihu mba ụwa ekwu okwu. Iji mee ka nke a pụta ihe ọchọcha jiri atụtụ treesi nke aghọtamokwu wee leba anya n’isiokwu a ma gbasoo usoro nchọcha nkọwa. Ebe nsiri nweta data bụ na intanet na ụfọdụ akwụkwọ akụkọ dị ka ‘vanguard’. Nchọpụta nchọcha na-egosi na nkwuhie (slips of tongue) bụ otu n’ime nkwujo (speech error) nke nsogbu ya n’esite na ebe mkpọpụta. Ọ bụghị ebumpụtauwa kama na o nwere ihe ndị na-akpata ha mgbe mmadụ na-ekwu okwu, tụmadi n’oha mmadụ. Dị ka ahụ ọma jiji, adịghị na njikere, amaghị usoro okwu. Ọchọcha tụnyere aro na ọ bụrụ na mmadụ chọọ ịzọ ọchịchị na a ga-anwale ya nke ọma n’ikwu okwu n’ọha mma tupu enye ya ọchịchị ahụ.

Article Details

How to Cite
Alozie, K. A., Ndubuisi, A. O., & Onuoha, J. A. (2023). NKWUJỌ NA NKWUHỊE NDỊ NDỌRỌNDỌRỌ ỌCHỊCHỊ, NDỊ ỌCHỊCHỊ NA NDỊ ỌRỤ GỌỌMENTỊ NAỊJIRỊA N’OKWU ỌHA. EBSU Journal of Social Sciences and Humanities, 13(2). Retrieved from https://ebsu-jssh.com/index.php/EBSUJSSH/article/view/112
Section
Articles
Author Biographies

Kelechi A. Alozie, University of Nigeria, Nsukka

Ngalaba Lingwistiks, Igbo Na Asụsụ Naịjirịa Ndị Ọzọ

Ahamefula O Ndubuisi, University of Nigeria, Nsukka

Ngalaba Lingwistiks, Igbo Na Asụs Naịjirịa Ndị Ọzọ

Joy Adaeze Onuoha, University of Nigeria, Nsukka

Igbo Unit, Humanities, School of General Studies