IKWU OKWU KWỤ ỌTỌ KA Ọ BỤ EKWUGHI EZIOKWU NTULE OKWU ỤFỌDỤ NDỊ ỌCHỊCHỊ NAỊJIRỊA A HỌỌRỌ

Main Article Content

NDUBUISI OGBONNA AHAMEFULA
JOY ADAEZE ONUOHA

Abstract

Akwụkwọ a mere ntule okwu ụfọdụ ndị ọchịchị Naịjirịa nke ọchịchị onyekwuo uche ya. N’otu oge maọbụ nke ọzọ n’usoro ọchịchị obodo, e nwere ụfọdụ okwu ndị siri ike n’obi ndị ha na-achị . Ndị ụlọ ọrụ mgbasa ozi nwegasịrị okwu ndị ahụ n’ebe dị icheiche, n’obodo dị icheiche nke gbadoro ụkwụ na oghere e nyere ikwu okwu na oghere e nyere ndị nta akụkọ . Okwu ndị ahụ n’usoro ọchịchị akaike nke Naịjirịa n’oge gara aga tinyere ajenda nke ọchịchị nke ugboro atọ (teno atọ), ọchịchị ndị amị, usoro ọchịchị akụkụ/mpaghara (zoonu) ga-ewepụta onyeisiala, ajenda afọ asaa otu taam, na nke mere ọdị nso a bụ Boko Haram na inyeaka ikwubilata ego ọnụ mmanụ ụgbọala nke ndị obodo na-akwụ. Lingwistik wepụtara ụzọ ntụcha maka okwu nta akụkọ niile. Ntule okwu, nturi maọbụ ntụcha okwu bụ ihe ndị pụtara nnukwu ihe n’ọmụmụ Lingwistik nke nyere anyị ụzọ pụrụ nnukwu iche e ji eme ntụcha okwu nke si n’ụlọ mgbasaozi. Akwụkwọ a chikọbara okwu dị icheiche ndị na-achị obodo kwuru n’ụlọ mgbasaozi ka ha bụrụ okwu ndị atụchara . Ebumnobi ime ntụcha a bụ iji chọpụta ma ha a na-ekwu eziokwu ka ọ bụ asị. Nke a ga-eme ka ndị a na-achị ghọtatụ mgbanwe dị n'asụsụ ndị na-achị achị ya na oke mmasị pụrụ iche ha nwere maka ọchịchị na ebumnobi ha n’ịghọrị ndị ha na-achị . N’ime okwu dị icheiche e kwuru maka ntule okwu, anyị were ntule okwu nke ọnọdụ eziokwu na nke nkwekọrịta . Akwụkwọ a chọpụtara na ụfọdụ ndị ọchịchị anaghị ekwu eziokwu mgbe ụfọdụ n’ihe ha na-ekwu iji ghọrịa ndị ha na-achị ma mee ka ha kweta n’okwu nke ha. Ya bụ, asụsụ ịghọrị mmadụ na ịsa isi. Etu ụdị asụsụ ahụ si kpalite mmụọ ga-eme ka ndị a na-agwa nabata maọbụ jụ ịnabata okwu ndị ahụ nke ndị nta akụkọ ga-enweta dịka ha si biputa ha n’akwụkwọ , n’igwe mgbasaozi nke eletrọnik, ma nke ikuku tinyere nke pụtakarịchara ihe ugbu a bụ ọwa ikuku mkparịta soshal midia (social media) dịka Fesbuuku (Facebook). Akwụkwọ a na-arịọ ndị ọchịchị ka ha jiri nwayọ ma welata aka n’okwu ha nwere ike ibute ekweghi ekwe na ọgbaghara n’etiti ha na ndị na-ahọ ọchịchị. Ọzọkwa , okwu ha kwesiri ịbụ nke ga-egosi na ha ga-arụ ọrụ n’usoro ndị ghọpụtara ha n’ọrụ nakwaazi na okwu ha bụ nke ndị ọha obodo n’efu.

Article Details

How to Cite
AHAMEFULA, N. O., & ONUOHA, J. A. (2024). IKWU OKWU KWỤ ỌTỌ KA Ọ BỤ EKWUGHI EZIOKWU: NTULE OKWU ỤFỌDỤ NDỊ ỌCHỊCHỊ NAỊJIRỊA A HỌỌRỌ. EBSU Journal of Social Sciences and Humanities, 14(2). Retrieved from https://ebsu-jssh.com/index.php/EBSUJSSH/article/view/182
Section
Articles
Author Biographies

NDUBUISI OGBONNA AHAMEFULA, University of Nigeria, Nsukka

Department of Linguistics, Igbo & Other Nigerian Languages

JOY ADAEZE ONUOHA, University of Nigeria, Enugu Campus

Igbo Unit, Humanities, School of General Studies