NYOCHA NSỤNỤBỤRỤ N’ASỤSỤ MMEBI DỊ N’ETIT MMADỤ ABỤỌ NWERE ỌRỊA NTỌNTỌ

Main Article Content

ESTHER CHIDIMMA ONUH
NDUBUISI OGBONNA AHAMEFULA
JOY ADAEZE ONUOHA

Abstract

Nchọcha a lebara anya na nsụnụbụrụ n’asụsụ mmebi dị n’etiti mmadụ abụọ nwere nwere ọrịa ntọntọ bụ ndị dị n’agbata afọ iri ise ruo afọ iri isii. Mbunuche nchọcha a bụ inyocha asụsụ mmadụ abụọ nwere ọrịa ntọntọ Brocas. E jiri usoro nkọwa nyochaa ihe a chọpụtara na nchọcha a. Ọ bụ usoro ajụjụ ọnụ ka e ji nweta njiatule nchọcha a. Ọ bụ atụtụ nke ebumpụta ụwa (Innatis) ka e jiri hazie nchọcha a. Ndị e jiri mee nchọcha a bụ ndị okenye abụọ nwere ọrịa ntọntọ Brocas n’Elugwu Ezike. Nchọpụta nchọcha a gosiri na ndị nwere ọrịa ntọntọ Brocas na-egosiputa ihe ndị a n’asụsụ ha: okwu ha na-adị nta (nwere oke), mkpọpụta okwu ha na-enwe ntụpọ, ahịrịokwu ha anaghị ezucha oke, ha na-echefu itinye okwu ụfọdụ n’ahịrịokwu ha dịka ‘na’ tinyere na ha anaghị etinye ngwaa n’ahịrịokwu ha. Ha na-enwekwa nsogbu n’odide ihe.

Article Details

How to Cite
ONUH, E. C., AHAMEFULA, N. O., & ONUOHA, J. A. (2024). NYOCHA NSỤNỤBỤRỤ N’ASỤSỤ MMEBI DỊ N’ETIT MMADỤ ABỤỌ NWERE ỌRỊA NTỌNTỌ. EBSU Journal of Social Sciences and Humanities, 14(2). Retrieved from https://ebsu-jssh.com/index.php/EBSUJSSH/article/view/181
Section
Articles
Author Biographies

ESTHER CHIDIMMA ONUH, MAHADUM NAIJIRỊA, NSỤKA

NGALABA AMỤMAMỤ SAYENSỊ ASỤSỤ, IGBO NA ASỤSỤ NAIJIRỊA NDỊ ỌZỌ

NDUBUISI OGBONNA AHAMEFULA, MAHADUM NAIJIRỊA, NSỤKA

NGALABA AMỤMAMỤ SAYENSỊ ASỤSỤ, IGBO NA ASỤSỤ NAIJIRỊA NDỊ ỌZỌ